2023 Google Trends: Nigerian Naira, Mohbad, Chelsea, Presidential Election na ihe ndị ọzọ a kachasị chọọ na Google n'afọ a

 


Obodo 'Nigeria', otiegwu a ma ama lara mmụọ na nso nso a bụ Ilerioluwa Aloba e ji 'Mohbad' maara, Onyeisiala Naijiria bụ Bola Tinubu na Ntuliaka Onyeisiala 2023 so na ihe ụmụ Naijiria tinyere anya achọ n'ịntanet n'afọ 2023.

Nnyocha ozi dị n'ihe na-ewuewu na Google gosiri n'ihe metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ịkpa obiụtọ na egwuregwu bọọlụ nakwa akụkọ banyere ha so n'ihe ndị mmadụ chọrọ n'afọ 2023 dịka ọ apịakọ.

Mohbad nwụrụ n'abalị 12 nke ọnwa Sepụtemba n'ụzọ edochaghị anya nke kpalitere ngagharịiwe ndị ntoroọbia bụ ndị kpọrọ oku ka e nyochaa etu o siri nwụọ.

Naijiria mere ntulaiaka onyeisiala n'ọnwa Febụwarị afọ 2023 nke ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka bụ Independent National Electoral Comission (Inec) kpọpụtara Bola Amhed Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.

Peter Obi bụ onye fere ọkọlọtọ 'Labour Party' na ntuliaka ọkwa onyeisiala 2023 ma gbaa onye nke atọ dịka Inec si kpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ.

Comments

Popular posts from this blog

"Viva Rai 2", Ilenia Pastorelli's "silent" performance at Fiorello in via Asiago

Pianofestival San Nicola: three centuries of music with the pianist Saulle

Monday Night Football highlights: Trevor Lawrence injured, Bengals defeat Jaguars in OT